8Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya. Ha ga-emi ọnụ, sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’
9Ndị mmadụ ga-aza, ‘Nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke ha azụ, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’ ”
10Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọ abụọ ndị a, ya bụ ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze.
11Eze Solomọn nyere Hiram, eze Taịa, iri obodo abụọ dị na Galili, nʼihi osisi sida, na osisi junipa, na ọlaedo niile Hiram butere ya dịka o si chọọ ya.
12Ma mgbe Hiram si Taịa gaa ịhụ obodo ndị a nke Solomọn nyere ya, ha amasịghị obi ya.