1 Ndị Eze 9

ndị ụmụ ụmụ ha niile fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-enweghị ike egbuchapụ, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa.

1 Kings 9:21 (UKJV) Their children that were left after them in the land, whom the children of Israel also were not able utterly to destroy, upon those did Solomon levy a tribute of bondservants unto this day.

19O wukwara ọtụtụ obodo ebe nchịkọba ihe, obodo ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.

20Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Amọrait, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị ahụ abụghị ndị Izrel),

21ndị ụmụ ụmụ ha niile fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-enweghị ike egbuchapụ, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa.

22Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu. Kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ọrụ nʼọchịchị, ndịisi ndị ọchịagha, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya.

23Ndị a bụkwa ndịisi na-ahụ ihe banyere ọrụ niile nke Solomọn ji nʼaka. Ndị Izrel dị narị ise na iri ise (550), ka e mere ndịisi na-elekọta ndị ọrụ Solomọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.