26Eze Solomọn wukwara ọtụtụ ụgbọ mmiri nʼEziọn Geba, bụ nke dị nʼakụkụ Elat, nʼọnụ mmiri Oke osimiri Uhie nʼala Edọm.
27Hiram zigaara ndị ikom ya na-anya ụgbọ, ndị maara ihe banyere ime njem osimiri nke ọma, ka ha soro ndị ikom Solomọn jee ozi nʼime ụgbọ ndị a.
28Ha nyaara ụgbọ gaa Ọfịa, site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na anọ na narị abụọ na asatọ.