1 Pita 1

Unu ndị Chineke bụ Nna họpụtara dị ka o bururị ụzọ mata na ọ ga-eme, jirikwa Mmụọ Nsọ ya doo unu nsọ, ka unu na-erubere Jisọs Kraịst isi, ka ewerekwa ọbara ya sachaa unu: Ka amara na udo baara unu ụba.

1 Peter 1:2 (UKJV) Elect according to the foreknowledge of God the Father, through sanctification of the Spirit, unto obedience and sprinkling of the blood of Jesus Christ: Grace unto you, and peace, be multiplied.

1Pita, onyeozi Jisọs Kraịst, Na-edegara unu ndị niile ndị a họpụtara, ndị gbara ọsọ ndụ gaa biri na Pọntọs, na Galeshịa, na Kapadosia, Eshịa na Bitinia, akwụkwọ a.

2Unu ndị Chineke bụ Nna họpụtara dị ka o bururị ụzọ mata na ọ ga-eme, jirikwa Mmụọ Nsọ ya doo unu nsọ, ka unu na-erubere Jisọs Kraịst isi, ka ewerekwa ọbara ya sachaa unu: Ka amara na udo baara unu ụba.

3Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst.

4Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.