1 Pita 1

Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe.

1 Peter 1:4 (UKJV) To an inheritance incorruptible, and undefiled, and that fades not away, reserved in heaven for you,

2Unu ndị Chineke bụ Nna họpụtara dị ka o bururị ụzọ mata na ọ ga-eme, jirikwa Mmụọ Nsọ ya doo unu nsọ, ka unu na-erubere Jisọs Kraịst isi, ka ewerekwa ọbara ya sachaa unu: Ka amara na udo baara unu ụba.

3Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst.

4Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe.

5Anyị bụ ndị e sitere nʼokwukwe na-echekwa nʼike Chineke, tutu ruo ọbịbịa nzọpụta ahụ, nke a na-ejikere ime ka ọ pụta ìhè nʼọgwụgwụ oge.

6Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.