3Otuto dịrị Chineke Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst! Site nʼịba ụba nke ebere ya, o nyela anyị ndụ ọhụrụ baa nʼolileanya dị ndụ site na mbilite nʼọnwụ Jisọs Kraịst.
4Anyị nwekwara ihe nketa nke na-apụghị imebi emebi, nke na-agaghị ere ure, maọbụ gbanwee ụdịdị ya, nke e debeere anyị nʼeluigwe.
5Anyị bụ ndị e sitere nʼokwukwe na-echekwa nʼike Chineke, tutu ruo ọbịbịa nzọpụta ahụ, nke a na-ejikere ime ka ọ pụta ìhè nʼọgwụgwụ oge.
6Nʼime ihe ndị a ka unu na-aṅụrị oke ọṅụ, ọ bụ ezie na nʼoge ndị a dị nta, unu agabigala ọtụtụ ihe mgbu nʼihi ụdị ọnwụnwa dị iche iche bịakwasịrị unu.
7Ọnwụnwa ndị a na-abịa ime ka okwukwe unu, nke dị oke ọnụahịa karịa ọlaedo na-ala nʼiyi nʼagbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya; bụrụ nke ga-eweta otuto, na ebube, na nsọpụrụ, mgbe e mere ka Jisọs Kraịst pụta ìhè.