1 Pita 1

Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa.

1 Peter 1:23 (UKJV) Being born again, not of corruptible seed, but of incorruptible, by the word of God, which lives and abides for ever.

21Ọ bụkwa site nʼaka ya ka unu ji bụrụ ndị kwere na Chineke, onye mere ka o si nʼọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, okwukwe unu na olileanya unu dị na Chineke.

22Ugbu a, ebe unu sitere nʼirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, nke mere na unu nwere ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị nʼebe ụmụnna unu nọ, sitenụ nʼobi unu na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya nʼebe ọ dị ukwuu.

23Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa.

24Nʼihi na, “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,

25ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.