23Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa.
24Nʼihi na, “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,
25ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu.