1Ya mere, wezuganụ nʼibu iro nʼobi na aghụghọ niile unu, kwụsịnụ ịgha ụgha, ịbụ ndị ihu abụọ, ndị na-ekwo ekworo, na ndị na-ekwutọ mmadụ ibe ha.
2Dịka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, bụrụnụ ndị agụụ ịṅụ mmiri ara nke Mmụọ Nsọ a na-agwaghị ihe ọbụla na-agụ, ka unu nwee ike site na ya na-eto eto nʼime nzọpụta unu.
3Ugbu a, unu detụrụla ya ire matakwa na Onyenwe anyị dị mma.