16Ma na-enwenụ akọnuche dị ọcha, ka ndị ahụ na-ekwulu ibi obi ọma unu nʼime Kraịst, bụrụ ndị ihere ga-eme banyere nkwutọ ha na-ekwutọ unu.
17Nʼihi na ọ ka mma ịta ahụhụ nʼihi ezi ihe ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụhụ nʼihi ajọ ihe.
18Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nʼihi unu otu mgbe. Onye ezi omume nwụrụ nʼihi ndị ajọ omume, ka ọ kpọrọ unu bịakwute Chineke. Nʼihi na e mere ka ọ nwụọ nʼanụ ahụ ma e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ ya.
19Mgbe emesịrị ka ọ dị ndụ na mmụọ ya, ọ gara kwusaa oziọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nʼụlọ mkpọrọ.
20Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachiobi chere ha nʼoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ naanị mmadụ asatọ nʼime ndị bi nʼoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ.