1 Pita 3

Mgbe emesịrị ka ọ dị ndụ na mmụọ ya, ọ gara kwusaa oziọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nʼụlọ mkpọrọ.

1 Peter 3:19 (UKJV) By which also he went and preached unto the spirits in prison;

17Nʼihi na ọ ka mma ịta ahụhụ nʼihi ezi ihe ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụhụ nʼihi ajọ ihe.

18Nʼihi na Kraịst nʼonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nʼihi unu otu mgbe. Onye ezi omume nwụrụ nʼihi ndị ajọ omume, ka ọ kpọrọ unu bịakwute Chineke. Nʼihi na e mere ka ọ nwụọ nʼanụ ahụ ma e mekwara ka ọ dị ndụ na mmụọ ya.

19Mgbe emesịrị ka ọ dị ndụ na mmụọ ya, ọ gara kwusaa oziọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nʼụlọ mkpọrọ.

20Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachiobi chere ha nʼoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ naanị mmadụ asatọ nʼime ndị bi nʼoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ.

21Mmiri a nọ ọnọdụ dị ka baptizim nke na-azọpụta unu ugbu a. Ọ anaghị asapụ unyi site nʼahụ mmadụ, kama ọ bụ ihe na-egosi ezi akọnuche nʼebe Chineke nọ. Ọ na-azọpụta unu site na mbilite nʼọnwụ nke Jisọs Kraịst,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.