1 Pita 3

Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala.

1 Peter 3:8 (UKJV) Finally, be all of you all of one mind, having compassion one of another, love as brethren, be pitiful, be courteous:

6Dịka Sera rubeere Ebraham isi, na-akpọkwa ya onyenwe m. Unu bụ ụmụ Sera ma ọ bụrụ na unu e mee ihe ziri ezi, na-ekweghị ka egwu tụọ unu.

7Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.

8Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala.

9Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.

10Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-achọ ndụ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma, ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.