7Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.
8Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala.
9Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ụgwọ ihe ọjọọ e mere unu, maọbụ nkwutọ nʼọnọdụ nkwutọ. Kama gọzienụ ha, nʼihi na ọ bụ ngọzị ka e kwere unu na nkwa iketa, mgbe a kpọrọ unu.
10Nʼihi na, “Onye ọbụla nke na-achọ ndụ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ndị ahụ dị mma, ya mee ka ire ya ghara ikwu okwu ọjọọ meekwa ka egbugbere ọnụ ya ghara ikwu okwu aghụghọ.
11Ka ha tụgharịa site nʼajọ ihe ma mee ezi ihe; ka ha chọọ udo, ma na-agbasokwa ya.