12Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche na-abịara unu nʼihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nʼebe unu nọ.
13Kama ṅụrịanụ ọṅụ nʼihi na unu so Kraịst na-eketa oke nʼahụhụ ya, ka e sikwa otu a mee ka obi unu jupụta nʼọṅụ, unu ga-etikwa mkpu ọṅụ mgbe a ga-eme ka ebube ya pụta ìhè.
14Ọ bụrụ na a na-ekwutọ unu nʼihi aha Kraịst, unu bụ ndị a gọziri agọzi. Nke a na-ezipụta na mmụọ nke ebube ahụ bụ mmụọ Chineke na-ebi nʼime unu.
15Ka onye ọbụla nʼime unu ghara ịta ahụhụ nʼihi na o gburu mmadụ maọbụ dị ka onye ohi, maọbụ dị ka onye na-eme ihe ọjọọ, maọbụ dị ka onye na-anara mmadụ ihe nʼaka ike.
16Ma ihere ekwesighị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke otuto na unu bụ ndị a na-akpọ aha ahụ.