12Ọ bụ site nʼinyeaka Saịlas onye m hụtara dị ka nwanna kwesiri ntụkwasị obi ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole ndị a nke m ji agbaa unu ume na-ekwupụtakwa na nke a bụ eziokwu dị nʼamara Chineke. Guzosienụ ike nʼime ya.
13Nwanyị ahụ nọ na Babilọn, nke a họpụtara unu na ya, na-ekele unu. Mak, ezi nwa m nwoke na-ekelekwa unu.
14Jirinụ isurita ọnụ ịhụnanya kelerịta onwe unu. Ka udo dịnyere unu niile nọ nʼime Kraịst.