11O kwere nkwa sị, “O! Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụrụ na ị ga-elekwasị anya na nhụju anya nke ohu gị nwanyị ma cheta m, ghara ichefu ohu gị nwanyị, ma nye ya nwa nwoke, mgbe ahụ, aga m enyeghachi ya Onyenwe anyị ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agakwaghị aga nʼisi ya mgbe ọbụla.”
12Mgbe ọ nọgidere na-ekpe ekpere nye Onyenwe anyị, Elayị nọ na-ele ya anya nʼọnụ.
13Ka Hana nọ na-ekpe ekpere nʼobi ya, naanị egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị, ma enweghị onye na-anụ olu ya. Mgbe ahụ, Elayị chere nʼobi ya na ọ bụ nwanyị mmanya na-egbu.
14Elayị sịrị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-akwụsị ịṅụbiga mmanya oke? Si nʼebe mmanya dị wezuga onwe gị!”
15Ma Hana zara sị ya, “Mba, onyenwe m, aṅụghị m mmanya ọbụla! Kama abụ m nwanyị obi ya dị ilu nke ukwuu. Anọ m na-ekwupụtara Onyenwe anyị ihe dị m nʼobi.