20Mgbe oge ruru, o mere ka Hana tụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Samuel, nʼihi na ọ sịrị, “Arịrịọ m Onyenwe anyị maka ya.”
21Mgbe di ya, bụ Elkena na ndị ezinaụlọ ya gara Shaịlo ịchụrụ Onyenwe anyị aja nke afọ ahụ, na ịchụkwa aja metụtara nkwa dị iche nke o kwere Onyenwe anyị,
22Hana esoghị ha, ọ gwara di ya, “Mgbe nwantakịrị a kwụsịrị ịṅụ ara, ka m duru ya ga chee ya nʼihu Onyenwe anyị, ọ ga-ebikwa nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi.”
23Elkena bụ di ya sịrị ya, “Mee ihe ọbụla i chere kwesiri ekwesi. Nọdụ ruo mgbe ọ hapụrụ ịṅụ ara, ma ka Onyenwe anyị mezuo okwu ya.” Hana nọgidere nʼụlọ tutu ruo mgbe ọ zụlitere nwantakịrị ahụ, kwụsị ya ịṅụ ara.
24Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo.