1 Samuel 1

Otu ụbọchị mgbe ha risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ na Shaịlo, Hana biliri ọtọ. Nʼoge a, Elayị onye nchụaja nọdụrụ ala nʼoche ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ Onyenwe anyị.

1 Samuel 1:9 (UKJV) So Hannah rose up after they had eaten in Shiloh, and after they had drunk. Now Eli the priest sat upon a seat by a post of the temple of the LORD.

7Ihe ndị a na-eme kwa afọ. Penina na-akwa Hana emo, na-achị ya ọchị oge niile ha gara nʼụlọ Onyenwe anyị, si otu a na-eme ka ọ na-akwa akwa, gharakwa iri nri.

8Mgbe Hana bidoro ịkwa akwa otu a, Elkena na-ajụ ya sị, “Hana, ọ bụ gịnị mere i ji na-akwa akwa? Gịnị mere ị naghị eri nri? Gịnị mere obi ji ajọ gị njọ? Ọ bụ na mụ adịghị gị mma karịa ụmụ ndị ikom iri nye gị?”

9Otu ụbọchị mgbe ha risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ na Shaịlo, Hana biliri ọtọ. Nʼoge a, Elayị onye nchụaja nọdụrụ ala nʼoche ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ Onyenwe anyị.

10Nʼọnọdụ obi mwute Hana kwara akwa, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị.

11O kwere nkwa sị, “O! Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụrụ na ị ga-elekwasị anya na nhụju anya nke ohu gị nwanyị ma cheta m, ghara ichefu ohu gị nwanyị, ma nye ya nwa nwoke, mgbe ahụ, aga m enyeghachi ya Onyenwe anyị ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agakwaghị aga nʼisi ya mgbe ọbụla.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.