17Emesịa, Samuel kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile na Mizpa, ka ha bịa zute Onyenwe anyị.
18Ọ gwara ha sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Mụ onwe m si nʼala Ijipt kpọpụta Izrel ma napụtakwa unu site nʼaka ike ndị Ijipt, na site nʼaka alaeze niile bụ ndị kpagburu unu.’
19Ma ugbu a, unu ajụla Chineke unu onye na-azọpụta unu site nʼihe ndakwasị na nhụju anya unu niile. Unu kwukwara sị, ‘Mba, nye anyị eze ga-achị anyị.’ Ugbu a, doonụ onwe unu nʼusoro nʼihu Onyenwe anyị dịka ebo unu na ikwu unu niile si dị.”
20Samuel mere ka ebo Izrel niile bịaruo nso nʼebo nʼebo, nza mara ebo Benjamin.
21O mere ka ebo Benjamin bịaruo nso nʼagbụrụ nʼagbụrụ, nza mara agbụrụ Matri. Nʼikpeazụ nza ahụ mara Sọl, nwa Kish. Ha chọgharịrị ya ma ha ahụghị ya.