15Ma nwanne nna Sọl sịrị, “Gwa m ihe Samuel gwara gị.”
16Sọl zara ya sị, “Ọ gwara anyị na a chọtala ịnyịnya ibu ndị ahụ.” Ma okwu gbasara alaeze, dịka Samuel siri kwuo ya, ọ gwaghị ya ihe ọbụla.
17Emesịa, Samuel kpọrọ nzukọ ndị Izrel niile na Mizpa, ka ha bịa zute Onyenwe anyị.
18Ọ gwara ha sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Mụ onwe m si nʼala Ijipt kpọpụta Izrel ma napụtakwa unu site nʼaka ike ndị Ijipt, na site nʼaka alaeze niile bụ ndị kpagburu unu.’
19Ma ugbu a, unu ajụla Chineke unu onye na-azọpụta unu site nʼihe ndakwasị na nhụju anya unu niile. Unu kwukwara sị, ‘Mba, nye anyị eze ga-achị anyị.’ Ugbu a, doonụ onwe unu nʼusoro nʼihu Onyenwe anyị dịka ebo unu na ikwu unu niile si dị.”