1 Samuel 10

Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?” Onyenwe anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.”

1 Samuel 10:22 (UKJV) Therefore they enquired of the LORD further, if the man should yet come thither. And the LORD answered, Behold he has hid himself among the stuff.

20Samuel mere ka ebo Izrel niile bịaruo nso nʼebo nʼebo, nza mara ebo Benjamin.

21O mere ka ebo Benjamin bịaruo nso nʼagbụrụ nʼagbụrụ, nza mara agbụrụ Matri. Nʼikpeazụ nza ahụ mara Sọl, nwa Kish. Ha chọgharịrị ya ma ha ahụghị ya.

22Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ, “Nwoke ahụ ọ bịala nʼebe a?” Onyenwe anyị sịrị, “E, Lee, o zoro onwe ya nʼetiti akpa ndị ahụ.”

23Ha gbaara gaa nʼebe ahụ kpọpụta ya. Mgbe ọ pụtara guzoro nʼetiti ha, ha hụrụ na o toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi.

24Samuel gwara ndị ahụ niile okwu sị, “Onye a bụ nwoke ahụ Onyenwe anyị họpụtara ka ọ bụrụ eze unu. Ọ dịghị onye ọzọ dịka ya nʼIzrel!” Mgbe ahụ, mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze dị ogologo ndụ gaa nʼihu!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.