1 Samuel 10

Mgbe Sọl laghachiri nʼobodo ya, bụ Gibea, ndị ikom ndị Chineke metụrụ aka nʼobi sooro ya.

1 Samuel 10:26 (UKJV) And Saul also went home to Gibeah; and there went with him a band of men, whose hearts God had touched.

24Samuel gwara ndị ahụ niile okwu sị, “Onye a bụ nwoke ahụ Onyenwe anyị họpụtara ka ọ bụrụ eze unu. Ọ dịghị onye ọzọ dịka ya nʼIzrel!” Mgbe ahụ, mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze dị ogologo ndụ gaa nʼihu!”

25Ọzọkwa, Samuel gwara ndị Izrel ihe bụ ọrụ eze, na ihe ruuru ya. O dekwara ihe ndị a nʼakwụkwọ, debe akwụkwọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Emesịa, Samuel mechiri nzukọ ahụ. Onye ọbụla laghachikwara nʼụlọ ya.

26Mgbe Sọl laghachiri nʼobodo ya, bụ Gibea, ndị ikom ndị Chineke metụrụ aka nʼobi sooro ya.

27Ma ụfọdụ ndị efulefu jọgburu onwe ha kwuru sị, “Olee otu nwoke a ga-esi zọpụta anyị?” Ha lelịrị ya anya, jụkwa iwetara ya onyinye ịnata ihuọma. Ma Sọl gbachitere ha nkịtị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.