1 Samuel 11

Mgbe Sọl nụrụ ozi a, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼike, iwe wekwara ya nke ukwuu.

1 Samuel 11:6 (UKJV) And the Spirit of God came upon Saul when he heard those tidings, and his anger was kindled greatly.

4Mgbe ndị ozi ha zipụrụ bịaruru Gibea, nke bụ obodo Sọl, ha kọọrọ ndị mmadụ ihe ndị a, ha niile dapụrụ nʼakwa.

5Ma nʼoge a, Sọl si nʼubi na-alọta, soro ụmụ ehi ya nʼazụ, ọ jụrụ, “Ọ bụ gịnị na-eme onye ọbụla? Gịnị mere na ha ji ebe akwa?” Ha kọọrọ ya ihe banyere ozi e si Jebesh zite.

6Mgbe Sọl nụrụ ozi a, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼike, iwe wekwara ya nke ukwuu.

7Ọ kpụpụtara ehi abụọ bọkasịa ha, zipụ ndị ozi ka ha buru ha ga obodo niile dị nʼIzrel. Ozi ha ga-ezi ndị obodo ọbụla bụ nke a. “Ọ bụ ihe e mere ehi ndị a ka a ga-eme ehi onye ọbụla jụrụ iso Sọl na Samuel jee ọgụ.” Onyenwe anyị mere ka egwu jide ndị Izrel niile. Nʼihi ya, ha niile bịakwutere Sọl dịka otu mmadụ.

8Mgbe Sọl kpọkọtara ha na Bezek, ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel dị narị puku atọ, tinyekwara iri puku mmadụ atọ, ndị sitere na Juda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.