1 Samuel 12

Ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela, anyị agbakụtala Onyenwe anyị azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’

1 Samuel 12:10 (UKJV) And they cried unto the LORD, and said, We have sinned, because we have forsaken the LORD, and have served Baalim and Ashtaroth: but now deliver us out of the hand of our enemies, and we will serve you.

8“Mgbe ụmụ Jekọb batara Ijipt, ha kpọkuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka. Onyenwe anyị zitere Mosis na Erọn, ndị kpọpụtara nna nna unu ha site nʼIjipt, mee ka ha bịa biri nʼebe a.

9“Ma ha chefuru Onyenwe anyị bụ Chineke ha, nʼihi ya o nyefere ha nʼaka Sisera, bụ ọchịagha eze Hazọ, nakwa nʼaka ndị Filistia, na eze ndị Moab, bụ ndị lụsoro ha ọgụ.

10Ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela, anyị agbakụtala Onyenwe anyị azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’

11Onyenwe anyị zitere Jerub-Baal, na Barak, na Jefta, na Samuel, ka ha zọpụta unu site nʼaka ndị iro nọ unu gburugburu, mee ka unu biri nʼudo.

12“Ma mgbe unu hụrụ na Nahash, eze ndị Amọn na-achọ ibuso unu agha, unu tụrụ egwu bịakwute m sị m, ‘Mba, anyị chọrọ eze ga-achị anyị,’ nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu bụ eze unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.