1 Samuel 13

Sọl gbara iri afọ atọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịkwara dịka eze nʼala Izrel iri afọ anọ na abụọ.

1 Samuel 13:1 (UKJV) Saul reigned one year; and when he had reigned two years over Israel,

1Sọl gbara iri afọ atọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịkwara dịka eze nʼala Izrel iri afọ anọ na abụọ.

2Sọl sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta puku ndị ikom atọ ka ha bụrụ ndị agha ya. Sọl na puku abụọ nọ na Mikmash nʼala ugwu ugwu Betel. Otu puku nọnyeere Jonatan na Gibea, nʼala Benjamin. Ndị ikom ndị fọdụrụ ka o zighachiri, onye ọbụla nʼụlọ ha.

3Ma Jonatan busoro ndị agha Filistia nọ na Geba agha. Ndị Filistia nụkwara ihe banyere ya. Mgbe ahụ, Sọl nyere iwu ka e gbuo opi ike nʼala Izrel niile, kwuo sị, “Unu ndị Hibru niile, geenụ ntị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.