1 Samuel 13

Ụfọdụ nʼime ndị agha Filistia kere onwe ha ụzọ atọ site nʼụlọ ikwu ndị Filistia pụta; otu ụzọ chere ihu nʼụzọ Ofra nʼakụkụ Shual,

1 Samuel 13:17 (UKJV) And the spoilers came out of the camp of the Philistines in three companies: one company turned unto the way that leads to Ophrah, unto the land of Shual:

15Samuel biliri hapụ Gilgal gaa Gibea nʼala Benjamin. Mgbe Sọl gụrụ ndị agha so ya, ọ chọpụtara na ha dị naanị narị isii.

16Sọl na nwa ya nwoke Jonatan, na narị mmadụ isii ndị soo ha nọ na Geba nʼala Benjamin, ebe ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Mikmash.

17Ụfọdụ nʼime ndị agha Filistia kere onwe ha ụzọ atọ site nʼụlọ ikwu ndị Filistia pụta; otu ụzọ chere ihu nʼụzọ Ofra nʼakụkụ Shual,

18nke ọzọ chere ihu ịga Bet-Horon, nke atọ chee ihu nʼụzọ oke ala dị na Ndagwurugwu Zeboiim, nke dị ọzara nso.

19Nʼoge ahụ, e nweghị ike ịchọta otu ọkpụ ụzụ nʼala Izrel, nʼihi na ndị Filistia sịrị, “Ma ọ bụghị otu a, ndị Hibru ga-akpụtara onwe ha mma agha maọbụ ùbe.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.