1 Samuel 13

Nʼoge ahụ, e nweghị ike ịchọta otu ọkpụ ụzụ nʼala Izrel, nʼihi na ndị Filistia sịrị, “Ma ọ bụghị otu a, ndị Hibru ga-akpụtara onwe ha mma agha maọbụ ùbe.”

1 Samuel 13:19 (UKJV) Now there was no smith found throughout all the land of Israel: for the Philistines said, Lest the Hebrews make them swords or spears:

17Ụfọdụ nʼime ndị agha Filistia kere onwe ha ụzọ atọ site nʼụlọ ikwu ndị Filistia pụta; otu ụzọ chere ihu nʼụzọ Ofra nʼakụkụ Shual,

18nke ọzọ chere ihu ịga Bet-Horon, nke atọ chee ihu nʼụzọ oke ala dị na Ndagwurugwu Zeboiim, nke dị ọzara nso.

19Nʼoge ahụ, e nweghị ike ịchọta otu ọkpụ ụzụ nʼala Izrel, nʼihi na ndị Filistia sịrị, “Ma ọ bụghị otu a, ndị Hibru ga-akpụtara onwe ha mma agha maọbụ ùbe.”

20Izrel niile na-ejekwuru ndị Filistia maka ịmụ ọgụ igwuze ala ha, maọbụ mma oge ha, maọbụ anyụike ha, maọbụ mma ha ji ewe ihe ubi.

21Ihe ha na-akwụ maka ịmụ ọgụ igwuze ala, na mma oge ha bụ ụzọ abụọ nke shekel e kere ụzọ atọ, maka ịmụ anyụike, na ndụdụ, ya na ịpị ndụdụ e ji achị ehi bụ, otu ụzọ nke shekel e kere ụzọ atọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.