10Ma ọ bụrụ na ha sị, ‘Rigokwutenụ anyị,’ anyị ga-emekwa otu ahụ, nʼihi na ọ ga-abụrụ anyị ihe ama na Onyenwe anyị enyela ha nʼaka anyị.”
11Ya mere, ha abụọ guzoro ebe ndị Filistia ga-ahụ ha. Mgbe ndị Filistia hụrụ ha, ha tiri mkpu sị, “Lee, ndị Hibru esitela nʼọnụ ebe ha zoro na-arịpụta.”
12Ndị ikom ndị na-anọ nʼebe nguzo ndị nche tikuru Jonatan na onye ahụ na-ebu ngwa agha ya sị, “Rigokwutenụ anyị, ka anyị mee unu ihe.” Jonatan gwara onye ahụ na-ebu ngwa agha, “Soro m nʼazụ rigota, nʼihi na Onyenwe anyị ewerela ha nyefee nʼaka Izrel.”
13Ya mere, Jonatan ji ikpere ya na aka ya rigoruo nʼebe ahụ; onye na-ebu ihe agha ya sokwa ya nʼazụ. Ma ndị agha Filistia daghachiri azụ mgbe Jonatan na onye na-ebu ihe agha ya bidoro igbu ha.
14Na ogbugbu mbụ ahụ, Jonatan na onye ahụ na-ebu ngwa agha ya gburu ọnụọgụgụ ndị Filistia dị iri abụọ. Ọ bụ nʼihe ha ka nketa ala ruru otu ọkara nʼekaa nʼọtụtụ.