8Jonatan gwara ya sị, “Bịa ka anyị ga, lee ihe anyị ga-eme. Anyị ga-apụkwuru ndị agha ahụ mee ka ha hụ anyị anya.
9Ọ bụrụ na ha asị, ‘Guzonụ ebe ahụ ruo mgbe anyị bịakwutere unu,’ anyị ga-echere ebe anyị nọ, anyị agaghị agakwuru ha.
10Ma ọ bụrụ na ha sị, ‘Rigokwutenụ anyị,’ anyị ga-emekwa otu ahụ, nʼihi na ọ ga-abụrụ anyị ihe ama na Onyenwe anyị enyela ha nʼaka anyị.”
11Ya mere, ha abụọ guzoro ebe ndị Filistia ga-ahụ ha. Mgbe ndị Filistia hụrụ ha, ha tiri mkpu sị, “Lee, ndị Hibru esitela nʼọnụ ebe ha zoro na-arịpụta.”
12Ndị ikom ndị na-anọ nʼebe nguzo ndị nche tikuru Jonatan na onye ahụ na-ebu ngwa agha ya sị, “Rigokwutenụ anyị, ka anyị mee unu ihe.” Jonatan gwara onye ahụ na-ebu ngwa agha, “Soro m nʼazụ rigota, nʼihi na Onyenwe anyị ewerela ha nyefee nʼaka Izrel.”