1 Samuel 14

Mgbe ahụ, Sọl na ndị niile ya na ha nọ jikọtara onwe ha baa nʼagha ahụ, ma lee, ndị Filistia ji mma agha na-egburita onwe ha. Ọgbaaghara dịkwa nʼebe niile.

1 Samuel 14:20 (UKJV) And Saul and all the people that were with him assembled themselves, and they came to the battle: and, behold, every man's sword was against his fellow, and there was a very great discomfiture.

18Sọl sịrị Ahija, “Bute igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” (Nʼoge ahụ igbe ọgbụgba ndụ dị nʼaka ụmụ Izrel.)

19Mgbe Sọl na-agwa onye nchụaja okwu, ụzụ na iti mkpu nke na-ada nʼụlọ ikwu ndị Filistia dara karịa, nʼihi ya, Sọl gwara onye nchụaja ahụ okwu sị ya, “Sepụ aka gị.”

20Mgbe ahụ, Sọl na ndị niile ya na ha nọ jikọtara onwe ha baa nʼagha ahụ, ma lee, ndị Filistia ji mma agha na-egburita onwe ha. Ọgbaaghara dịkwa nʼebe niile.

21Ma ndị Hibru, ndị so ndị Filistia na-alụ ọgụ, tụgharịrị dịnyere ndị Izrel soro Sọl na Jonatan.

22Emesịa, ndị ikom Izrel niile, ndị ahụ zoro onwe ha nʼala ugwu ugwu Ifrem pụtara, mgbe ha hụrụ na ndị Filistia na-agba ọsọ. Ha gbapụtara soro ndị ọzọ ịchụ ndị Filistia ọsọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.