27Ma Jonatan anụghị na nna ya mere ka ndị ahụ ṅụọ iyi, ya mere, o setịpụrụ ọnụ ọnụ mkpanaka dị ya nʼaka rụta mmanụ aṅụ na ugbugbo ya, tinye nʼọnụ ya rachaa. Nke a mere ka ike ya laghachite.
28Ma otu onye agha gwara ya sị, “Nna gị ji ịṅụ iyi gbaa ndị agha niile iwu, sị, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ, onye riri nri taa. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji ada mba.’ ”
29Jonatan zara sị, “Nna m esitela nʼiwu dị otu a wetara ala anyị nsogbu. Lee ka m si nweta ike site na mmanụ aṅụ nta m rachara.
30Ọ garaghị aka mma ma a sị na ndị ikom riri ihe ha si nʼaka ndị iro ha kwata nʼagha? Ọ bụ na ogbugbu a gaara egbu ndị Filistia agaraghị adị ukwuu karịa?”
31Ma ndị agha Izrel bu agụụ tigbuo ndị Filistia, chụọkwa ha ọsọ site na Mikmash ruo Aijalon. Ha dakwara mba karịa.