1 Samuel 14

Ma Jonatan anụghị na nna ya mere ka ndị ahụ ṅụọ iyi, ya mere, o setịpụrụ ọnụ ọnụ mkpanaka dị ya nʼaka rụta mmanụ aṅụ na ugbugbo ya, tinye nʼọnụ ya rachaa. Nke a mere ka ike ya laghachite.

1 Samuel 14:27 (UKJV) But Jonathan heard not when his father charged the people with the oath: wherefore he put forth the end of the rod that was in his hand, and dipped it in an honeycomb, and put his hand to his mouth; and his eyes were enlightened.

25Ndị agha ahụ niile banyere nʼọhịa ebe mmanụ aṅụ dị nʼala.

26Mgbe ha banyere nʼọhịa, ha hụrụ mmanụ aṅụ ebe ọ na-asọpụta, ma o nweghị onye metụrụ aka nʼọnụ ya, nʼihi na ha tụrụ egwu iyi ahụ ha ṅụrụ.

27Ma Jonatan anụghị na nna ya mere ka ndị ahụ ṅụọ iyi, ya mere, o setịpụrụ ọnụ ọnụ mkpanaka dị ya nʼaka rụta mmanụ aṅụ na ugbugbo ya, tinye nʼọnụ ya rachaa. Nke a mere ka ike ya laghachite.

28Ma otu onye agha gwara ya sị, “Nna gị ji ịṅụ iyi gbaa ndị agha niile iwu, sị, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka nwoke ahụ bụ, onye riri nri taa. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji ada mba.’ ”

29Jonatan zara sị, “Nna m esitela nʼiwu dị otu a wetara ala anyị nsogbu. Lee ka m si nweta ike site na mmanụ aṅụ nta m rachara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.