1 Samuel 14

Emesịa, Sọl wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja. Nke a bụ ebe ịchụ aja nke mbụ o wuru.

1 Samuel 14:35 (UKJV) And Saul built an altar unto the LORD: the same was the first altar that he built unto the LORD.

33Ma otu onye gwara Sọl sị, “Ndị ikom Izrel na-emehie megide Onyenwe anyị site na iri anụ ọbara ya dị nʼahụ ya.” Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ihe dị otu a jọgburu onwe ya. Nutenụ nkume ukwuu nʼebe a ugbu a.”

34Sọl sịrị, “Gaa nʼetiti ndị ikom a gwa ha, ‘Ka onye ọbụla weta ehi na atụrụ ha chọrọ igbu nʼebe a, ka e gbuo ha nʼebe a, rie anụ ha. Unu emehiela megide Onyenwe anyị site nʼiri anụ ọbara dị nʼime ya.’ ” Ya mere, onye ọbụla wetara ehi ya nʼabalị ahụ, gbuo nʼebe ahụ.

35Emesịa, Sọl wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja. Nke a bụ ebe ịchụ aja nke mbụ o wuru.

36Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya sị, “Ka anyị gaa chụọ ndị Filistia ọsọ nʼabalị a niile, ma gbukwaa onye ọbụla fọdụrụ nʼime ha.” Ndị agha ya zara sị, “Ọ dị mma, mee dịka ị kwuru.” Ma onye nchụaja sịrị, “Ka anyị buru ụzọ jụta ihe bụ uche Chineke.”

37Mgbe ahụ, Sọl jụrụ Chineke sị, “Ọ bụ m rịda gaa chụso ndị Filistia? Ị ga-enyefe ha nʼaka ndị Izrel?” Ma Chineke enyeghị ya ọsịsa ọbụla nʼụbọchị ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.