32Ha dakwasịrị ihe a kwatara nʼagha, gbuo atụrụ na ehi na ụmụ ehi, bido iri anụ ha na ndụ nʼihi agụụ.
33Ma otu onye gwara Sọl sị, “Ndị ikom Izrel na-emehie megide Onyenwe anyị site na iri anụ ọbara ya dị nʼahụ ya.” Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ihe dị otu a jọgburu onwe ya. Nutenụ nkume ukwuu nʼebe a ugbu a.”
34Sọl sịrị, “Gaa nʼetiti ndị ikom a gwa ha, ‘Ka onye ọbụla weta ehi na atụrụ ha chọrọ igbu nʼebe a, ka e gbuo ha nʼebe a, rie anụ ha. Unu emehiela megide Onyenwe anyị site nʼiri anụ ọbara dị nʼime ya.’ ” Ya mere, onye ọbụla wetara ehi ya nʼabalị ahụ, gbuo nʼebe ahụ.
35Emesịa, Sọl wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja. Nke a bụ ebe ịchụ aja nke mbụ o wuru.
36Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya sị, “Ka anyị gaa chụọ ndị Filistia ọsọ nʼabalị a niile, ma gbukwaa onye ọbụla fọdụrụ nʼime ha.” Ndị agha ya zara sị, “Ọ dị mma, mee dịka ị kwuru.” Ma onye nchụaja sịrị, “Ka anyị buru ụzọ jụta ihe bụ uche Chineke.”