1 Samuel 14

Sọl gwara ndịisi agha Izrel okwu sị, “Ihe emebiela! Anyị aghaghị ịchọpụta ụdị mmehie anyị mere taa, nke mere Onyenwe anyị ji jụ inye anyị ọsịsa.

1 Samuel 14:38 (UKJV) And Saul said, Draw all of you near here, all the chief of the people: and know and see wherein this sin has been this day.

36Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị agha ya sị, “Ka anyị gaa chụọ ndị Filistia ọsọ nʼabalị a niile, ma gbukwaa onye ọbụla fọdụrụ nʼime ha.” Ndị agha ya zara sị, “Ọ dị mma, mee dịka ị kwuru.” Ma onye nchụaja sịrị, “Ka anyị buru ụzọ jụta ihe bụ uche Chineke.”

37Mgbe ahụ, Sọl jụrụ Chineke sị, “Ọ bụ m rịda gaa chụso ndị Filistia? Ị ga-enyefe ha nʼaka ndị Izrel?” Ma Chineke enyeghị ya ọsịsa ọbụla nʼụbọchị ahụ.

38Sọl gwara ndịisi agha Izrel okwu sị, “Ihe emebiela! Anyị aghaghị ịchọpụta ụdị mmehie anyị mere taa, nke mere Onyenwe anyị ji jụ inye anyị ọsịsa.

39Nʼezie dịka Onyenwe anyị, onye na-azọpụta Izrel na-adị ndụ, a sịkwarị na ọ bụ nwa m Jonatan ka a chọpụtara na ọ bụ ya ka ikpe mara, ọ ga-anwụ!” Ma ọ dịghị onye gwara ya ihe ọbụla.

40Mgbe ahụ, Sọl gwara ndị Izrel niile okwu sị ha, “Guzonụ onwe unu nʼebe ahụ, mụ na nwa m Jonatan ga-eguzo onwe anyị nʼebe a.” Ndị ahụ zara sị, “Mee ihe ọbụla dị gị mma.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.