50Aha nwunye Sọl bụ Ahinoam, ada Ahimaaz. Ọchịagha Sọl bụ Abna, nwa Nea, nwanne nna Sọl.
51Nea, nna Abna, na Kish, nna Sọl bụ ụmụnne. Ha bụ ụmụ Abiel.
52Ndị Izrel na ndị Filistia nọ nʼagha dị egwu ụbọchị niile Sọl bụ eze. Mgbe ọbụla Sọl hụrụ nwoke dị ike, maọbụ dimkpa, ọ na-eduru ya mee ya ka ọ bụrụ otu nʼime ndị agha ya.