1 Samuel 15

Samuel sịrị Sọl, “Mụ ka Onyenwe anyị zitere ite gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị ya, bụ Izrel. Ya mere, gee ntị nʼozi sitere nʼaka Onyenwe anyị bịa.

1 Samuel 15:1 (UKJV) Samuel also said unto Saul, The LORD sent me to anoint you to be king over his people, over Israel: now therefore hearken you unto the voice of the words of the LORD.

1Samuel sịrị Sọl, “Mụ ka Onyenwe anyị zitere ite gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị ya, bụ Izrel. Ya mere, gee ntị nʼozi sitere nʼaka Onyenwe anyị bịa.

2Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Aga m ata ndị Amalek ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere Izrel, mgbe ha nọchiri ha nʼụzọ oge ha si Ijipt pụta.

3Ugbu a, gaa buso ndị Amalek agha. Gbuchapụ ihe niile ha nwere. Enwekwala ọmịiko nʼahụ ha. Gbuo ndị ikom niile, ndị inyom niile, ụmụntakịrị niile na ụmụ na-aṅụ ara, igwe ehi na atụrụ, ịnyịnya kamel na ịnyịnya ibu ha niile.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.