1 Samuel 15

Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Aga m ata ndị Amalek ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere Izrel, mgbe ha nọchiri ha nʼụzọ oge ha si Ijipt pụta.

1 Samuel 15:2 (UKJV) Thus says the LORD of hosts, I remember that which Amalek did to Israel, how he laid wait for him in the way, when he came up from Egypt.

1Samuel sịrị Sọl, “Mụ ka Onyenwe anyị zitere ite gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị ya, bụ Izrel. Ya mere, gee ntị nʼozi sitere nʼaka Onyenwe anyị bịa.

2Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Aga m ata ndị Amalek ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere Izrel, mgbe ha nọchiri ha nʼụzọ oge ha si Ijipt pụta.

3Ugbu a, gaa buso ndị Amalek agha. Gbuchapụ ihe niile ha nwere. Enwekwala ọmịiko nʼahụ ha. Gbuo ndị ikom niile, ndị inyom niile, ụmụntakịrị niile na ụmụ na-aṅụ ara, igwe ehi na atụrụ, ịnyịnya kamel na ịnyịnya ibu ha niile.’ ”

4Ya mere, Sọl chịkọtara ndị agha ya mee ka ha zukọtaa nʼobodo Telaim. Ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ, ndị agha ji ụkwụ, tinyere puku ndị ikom iri si na Juda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.