1 Samuel 15

Onyenwe anyị ziri gị ijere ya ozi, gwa gị sị, ‘Gaa, laa ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị Amalek nʼiyi; buso ha agha ruo mgbe ị kpochapụrụ ha niile.’

1 Samuel 15:18 (UKJV) And the LORD sent you on a journey, and said, Go and utterly destroy the sinners the Amalekites, and fight against them until they be consumed.

16Mgbe ahụ Samuel gwara Sọl sị, “Ekwukwala ọzọ! Gee ntị nụrụ ihe Onyenwe anyị gwara m nʼabalị!” Sọl zara ya sị, “Kwuo, gịnị ka ọ gwara gị?”

17Samuel gwara ya sị, “Ọ bụghị ezie nʼagbanyeghị na ị dịrịị ntakịrị nʼanya gị onwe gị, ma ị bụụrụ onyeisi ndị ebo Izrel niile? Onyenwe anyị tere gị mmanụ ibu eze ndị Izrel.

18Onyenwe anyị ziri gị ijere ya ozi, gwa gị sị, ‘Gaa, laa ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị Amalek nʼiyi; buso ha agha ruo mgbe ị kpochapụrụ ha niile.’

19Gịnị mere i geghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị ime ihe o kwuru? Gịnị mere i ji chụrụ ihe nkwata gaa, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị?”

20Ma Sọl sịrị ya, “Ma erubeere m Onyenwe anyị isi. Ejere m ozi ahụ Onyenwe anyị zigara m. Anwụtara m Agag eze Amalek na ndụ, ma gbuchapụ ndị Amalek niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.