20Ma Sọl sịrị ya, “Ma erubeere m Onyenwe anyị isi. Ejere m ozi ahụ Onyenwe anyị zigara m. Anwụtara m Agag eze Amalek na ndụ, ma gbuchapụ ndị Amalek niile.
21Ndị agha sitere nʼihe a kwatara nʼagha were ụfọdụ atụrụ na ehi, bụ ndị kachasị mma nʼetiti ihe ndị ahụ e debere iche maka ịla ha nʼiyi, iji ha chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja na Gilgal.”
22Ma Samuel sịrị, “Ihe na-atọ Onyenwe anyị ụtọ ọ bụ onyinye na aja nsure ọkụ dịka nrube isi nye ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta? Nrube isi dị mma karịa ịchụ aja ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebule.
23Nʼihi na nnupu isi dịka mmehie ịgba afa, mpako dịkwa njọ dịka ikpere arụsị. Nʼihi na ị jụla okwu Onyenwe anyị ya onwe ya ajụkwala gị dịka eze.”
24Sọl zara Samuel sị ya, “Emehiela m. Nʼezie, enupula m isi na ndụmọdụ gị na nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ bụ nʼihi na m tụrụ egwu ndị Izrel ka m ji mee ihe ha chọrọ.