25Biko, gbaghara m mmehie m ugbu a, bịakwa soro m ka m gaa fee Onyenwe anyị ofufe.”
26Ma Samuel sịrị ya, “Agaghị m eso gị laghachi azụ. Ebe ị jụrụ okwu Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ajụkwala gị dịka eze ndị Izrel!”
27Mgbe Samuel tụgharịrị ka o si nʼebe ahụ pụọ, Sọl jidere ya nʼọnụ ọnụ uwe ya ime ka ọ lọghachi azụ, ma uwe ahụ dọwara.
28Mgbe ahụ, Samuel zara sị ya, “Taa Onyenwe anyị adọwapụla alaeze Izrel site nʼaka gị were ya nyefee otu nʼime ndị agbataobi gị, onye ka gị mma.
29Chineke, onye bụ Ebube Izrel, anaghị agha ụgha; ọ nakwaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị mmadụ efu!”