30Ma Sọl malitekwara ịrịọ arịrịọ ọzọ sị, “Emehiela m. Ma, sọpụrụ m ugbu a nʼihu ndị okenye ndị m, na nʼihu ndị Izrel. Lọghachi soro m ka m gaa fee Onyenwe anyị Chineke gị ofufe.”
31Ya mere, Samuel kwenyere soro Sọl laghachi, Sọl kpọkwara isiala nye Onyenwe anyị.
32Mgbe ahụ, Samuel gwara ya okwu sị ya, “Kpọpụtara m Agag, eze ndị Amalek.” Agag ji ihu ọchị bịakwute ya, nʼihi na o chere sị, “Nʼezie oge ọnwụ agaala.”
33Ma Samuel kwuru sị, “Dịka mma agha gị sị gbawa ndị inyom aka ụmụ otu a ka nne gị ga-esi bụrụ onye na-enweghị nwa nʼetiti ndị inyom.” Samuel gburu Agag nʼihu Onyenwe anyị na Gilgal.
34Emesịa, Samuel lara nʼụlọ ya na Rema. Ma Sọl laghachikwara na Gibea, obodo nke aka ya.