1 Samuel 16

Sọl kwenyere sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ chọta ma kpọtara m nwoke na-akpọ ụbọ akwara nke ọma.”

1 Samuel 16:17 (UKJV) And Saul said unto his servants, Provide me now a man that can play well, and bring him to me.

15Ndị na-ejere Sọl ozi gwara ya okwu sị, “Lee, mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa na-enye gị nsogbu.

16Biko, ka onyenwe anyị nye ndị ohu ya nọ nʼebe a ike, ka ha gaa chọta onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ ga-akpọ ụbọ akwara mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa bịakwasịrị gị, ime ka ahụ dị gị mma.”

17Sọl kwenyere sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ chọta ma kpọtara m nwoke na-akpọ ụbọ akwara nke ọma.”

18Otu onye nʼime ndị na-eje ozi kwuru sị, “Lee, ahụla m otu nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, onye Betlehem, onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ bụ dike na ọka nʼagha. Ọ bụ onye na-ekwu okwu nke ọma, na nwoke mara mma ile anya. Onyenwe anyị nọnyekwara ya.”

19Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Jesi sị ya, “Zitere m nwa gị nwoke Devid, onye na-azụrụ gị atụrụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.