17Sọl kwenyere sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ chọta ma kpọtara m nwoke na-akpọ ụbọ akwara nke ọma.”
18Otu onye nʼime ndị na-eje ozi kwuru sị, “Lee, ahụla m otu nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, onye Betlehem, onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ bụ dike na ọka nʼagha. Ọ bụ onye na-ekwu okwu nke ọma, na nwoke mara mma ile anya. Onyenwe anyị nọnyekwara ya.”
19Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Jesi sị ya, “Zitere m nwa gị nwoke Devid, onye na-azụrụ gị atụrụ.”
20Ya mere Jesi zipụrụ Devid ka o jekwuru Sọl. O mekwara ka Devid duru otu ịnyịnya ibu nke o bukwasịrị achịcha, na otu karama akpụkpọ mmanya, na otu nwa ewu, onyinye a na-enye Sọl.
21Devid bịakwutere Sọl, banye nʼọrụ ijere ya ozi. Sọl hụrụ ya nʼanya nke ukwuu, nʼihi ya, Devid ghọrọ otu nʼime ndị na-ebu ihe agha Sọl.