1Nʼoge a, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha ọnụ, zukọtaa nʼobodo Sokoh nke dị na Juda maka ibu agha. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼEfes Damim, nke dị nʼagbata Sokoh na Azeka.
2Mgbe ahụ, Sọl na ndị Izrel niile zukọtara maa ụlọ ikwu nke ha na ndagwurugwu Ịla. Ha doro onwe ha nʼusoro agha izute ndị Filistia.
3Ndị Filistia doro onwe ha nʼelu ugwu nʼotu akụkụ, ma ndị Izrel dokwara onwe ha nʼelu ugwu nʼakụkụ nke ọzọ. Ndagwurugwu dịkwa nʼetiti ha.