14Devid bụ ọdụdụ nwa. Ụmụnne ya ndị okenye atọ na-eso Sọl.
15Ma Devid na-apụ jekwuru Sọl, ma na-alaghachikwa nʼụlọ ịzụ atụrụ nna ya na Betlehem.
16Golaịat, onye Filistia na-abịaru nso ụtụtụ na uhuruchi, na-eguzo onwe ya otu a iri ụbọchị anọ.
17Otu ụbọchị, Jesi gwara Devid okwu sị, “Bịa ka i wegara ụmụnne gị otu akpa ọka ndị a e ghere eghe. Chịrịkwa ogbe achịcha iri ndị a chịlara ha.
18Wegakwara onyeisi usuu ha, iri chiizi, ndị a. Chọpụta otu ihe si agara ụmụnne gị natakwa ha ihe ị ga-egosi anyị na ha dị ndụ.”