21Ndị Izrel na ndị Filistia dokwara onwe ha nʼusoro izute onwe ha nʼagha, ndị agha megide ndị agha.
22Devid hapụrụ ihe ndị ahụ nʼaka onye na-elekọta akpa niile, gbara ọsọ gaa nʼusoro ndị agha jụọ ụmụnne ya banyere udo ha.
23Ma mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, onye mmeri nʼọgbọ agha, onye Filistia nke Gat, Golaịat bụ aha ya, sitere nʼusoro ndị agha Filistia pụta, kwuokwa okwu niile ahụ dịka ọ na-ekwu na mbụ. Devid nụrụ ihe o kwuru.
24Mgbe ndị Izrel niile hụrụ nwoke a, ha gbara ọsọ pụọ nʼihu ya ma tụọkwa oke egwu.
25Ndị Izrel sịrị, “Unu hụrụ nwoke a na-eguzo onwe ya? Ọ bụ ka ọ kparịa nnọọ ndị Izrel ka o ji apụta? Eze kwere nkwa inye onye ọbụla ga-etigbu ya akụ nʼebe ọ bara ụba. Ọ ga-akpọnyekwa ya nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya, meekwa ka ndị ezinaụlọ onye ahụ gharakwa ịtụ ụtụ taks ọzọ nʼIzrel!”