31Nʼikpeazụ, mgbe a matara ihe bụ uche Devid, e mere ka Sọl mara ihe banyere Devid. Sọl zikwara ozi ka a kpọọ ya.
32Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye Filistia a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.”
33Ma Sọl zaghachiri, “Ị pụghị ibuso onye Filistia a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa.”
34Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ,
35achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya.