29Ma Devid zara sị ya, “Oleekwanụ ihe m mere ugbu a? Adara m iwu nʼihi na m jụrụ ajụjụ?”
30Devid chigharịkwara jekwuru onye ọzọ jụọkwa ya otu ajụjụ ahụ. Ọ natakwara otu ụdị ọsịsa ahụ.
31Nʼikpeazụ, mgbe a matara ihe bụ uche Devid, e mere ka Sọl mara ihe banyere Devid. Sọl zikwara ozi ka a kpọọ ya.
32Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye Filistia a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.”
33Ma Sọl zaghachiri, “Ị pụghị ibuso onye Filistia a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa.”