1 Samuel 17

O lere Devid anya hụ na ọ bụ naanị nwantakịrị nwoke, onye ahụ dị mma, onye mara mma ile anya. Nʼihi ya, o ledara Devid anya.

1 Samuel 17:42 (UKJV) And when the Philistine looked about, and saw David, he disdained him: for he was but a youth, and rosy, and of a fair countenance.

40Emesịa, o were mkpanaka ya nʼaka ya, site nʼiyi họpụta nkume ise dị mụrụmụrụ tinye ha nʼakpa nta dị nʼime akpa onye ọzụzụ atụrụ ya. O jidere ebe ya nʼaka ya, malite ịpụkwuru onye Filistia ahụ.

41Onye Filistia ahụ, na-abịa nso na-apụkwute Devid, onye ahụ na-ebu ọta ya na-agakwa nʼihu ya.

42O lere Devid anya hụ na ọ bụ naanị nwantakịrị nwoke, onye ahụ dị mma, onye mara mma ile anya. Nʼihi ya, o ledara Devid anya.

43Ọ sịrị Devid, “Abụ m nkịta, na i ji mkpanaka na-abịakwute m?” Onye Filistia ahụ ji aha chi niile ya bụọ Devid ọnụ.

44Ọ sịrị, “Bịa nʼebe a ka m were anụ ahụ gị mere anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa niile ihe oriri!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.